Ndịnaya
Mmalite
Igbo
bụ aha agbụrụ bụrụkwa aha asụsụ ha.[1] Abịa
n’obodo ọbụla, otu na ihe ndi omenala eji ama obodo bụ asụsụ ha. Ya mere na a bịa
n’obodo m bụ Igogoro Enugwu Ezike, ha nwere otu asụsụ (olundi) eji mara ha nke
mere na onye ọbụla sụrụ ya bụ asụsụ ebe ọbụla, na-ana ama na onye ahụ bụ onye
Igogoro Enugwu Ezike.
Omenala
ọbụla nwere asụsụ, nwekwa ụdị nri ha na eri, ya na akwa ha na-eyi n’ahụ ha.
Mana nke kacha dị mkpa na ime ha bụ asụsụ maka na asụsụ bụ otu ihe dịkarịsịrị
mkpa na ndụ mmadụ[2].
Ọbụ maka nke a ka eji nwee ọtụtụ olundị n’asụsụ anyi bụ Igbo maka na ọbụ otu ụzọ
na ihe kacha dị mkpa eji enwe mmekọrịta na etiti ndi mmadụ. Ọbụ ya kpatara eji
asị na asụsụ mejupụtara obodo, obodo emejupụta asụsụ.[3]
N’ime
ederede a, agam egosipụta ndi bu ndi Igbo, ebe ha bị n’ala Naịgerịa, Ebe obodo
m si puta n’ ala Igbo, n’ asusu Igbo, olundi ndi obodo m na asụsụ Igbo izugbe na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
Ihe
kpatara m agaghị eleghara olundi anya bu na di ka Ọkammụta Longinus si kwuo “na
asụsụ na-ewepụta uche (ideas); ọ bụ n’ime asụsụ ka eji amata uche.”[4]
Mazị Eke nwa Onu kwụkwara si, na olu ndi obodo kacha eweputa uche n’asụsụ ọkacha
oge onye na-asụ ya bu asụsụ ji olundi eji mara obodo ya wee na-asụ ya bu asụsụ.[5]
Ya
bụ, na-abịa n’ obodo m bụ Igogoro Enugwu Ezike, onye ọbụla chọrọ izi ndi mmadu
ozi mọbụ chọrọ igwa ndi obodo okwu ma chọọ ka egee ya ntị, ga eji olundi eji
mara Igogoro Enugwu Ezike wee kwuo ya bu okwu.
Ndịigbo
Ndịigbo
so n’otu n’ime agbụrụ ndị bụ ọkaibe n’ala Naịjirịa. Ọ bụ ha mejupụtara mpaghara
Ọwụwaanyanwụ Naịjirịa. Ha jụpụtara n’agbata latitude 5 na 8 n’Ọwụwaanyanwụ ya.[6] Ha
bichiri obosaraala dịka 50,641 kilomita (15,800 sqm).[7]Obodo
ndị di na ala Igbo bụ ndịa; Anịọma taa na Steti Delta, imereime obodo dị na
Steeti Rivas na Bayelsa gụrụ gawakwa ọtụtụ ndị nọcha n’ebe a na-akpọbu Steeti
Benue na ndị banyekwara na Steeti Abịa, Anambara, Ebomyi, Enugwu na Imo.[8]
Ndi Igbo bịsachara ebe niile di na uwa. Abịa n’Naịgirịa, ọnụọgụgụ ndi Igbo bu
ihe dị ka 32,000,000.[9]
Ndi bi n’ United States bu ihe dika ọnụ ọgụgụ 220,000. Ndị bị n’ Cameroon bu
ihe dịka ọnụọgụgụ 100,000. Ndị bị n’ Ghana bu ihe dịka ọnụọgụgụ 60,000.[10]
Igogoro Enugwu Ezike.
Igogoro
bu otu na ime ọtụtụ obodo dị n’ime nnukwu obodo ana akpọ Enugwu Ezike. Obodo ndị
ahụ di n’ime Enugwu Ezike gunyere ndịa; Aguibeje, Ajị, Amachalla, Amaja,
Amufie, Ette, Ezillo, Ekposhi, Igogoro, Umuogbo Agụ, Umuopu Agụ, Ikpamodo,
Ikpuiga, Imufu, Inyi, Isiugwu, Iyionu, Umugbo Ekposhi, Nkpamute, Ogbodu,
Ogrute, Okata, Umuogbo Ulo, Okpo, Olido, Owerre Eze, Uda, Ufodo, Ugbaike,
Umuagama, Umuida, Umuopu, Uroshi na Umunaji.[11]
Obodo
niile ndịa nwere otu asụsụ ma ewezụga Ette. Ihe mere Ette ji wee na-asu Asụsụ dị
iche bụ maka na ha na ndi Igala bị nso, na emekoritakwa ihe ọnụ. Na agbnyeghi
nkea, ọtụtụ na ime ha na-asụkwa olu ndi eji mara Enugwu Ezike. Obodo ndi a
niile nwere otu omenala mana na-asukwa otu olu ndi.
Na-agbanyeghi
nkea, eji idikọ na otu mara obodo Igogoro. Na eserese a di n’elu ihu akwụkwọ a
bu onye ọ bụ ya wetetara ụzọ na Igogoro nke na mmadu enweghi ike ikwu maka
Igogoro ma okwughi maka Maazị Obeta Nwa Ọme.[12]
Ebe Igogoro Enugwu Ezike dị
Abia
na ala igbo, enwere mpaghara di iche iche nke esi ama ebe obodo ọbụla si wee pụta.
Enwere; Igbo ndi mgbagougwu, Igbo ndị Ndidaanyanwụ Ọsimiri Naija, Igbo ndi Nnọnetiti
Ọwụwaanyanwụ (maọbụ Igbo Nnọnetiti), Igbo ndi krọs Riva, Igbo ndi Mgbago Ọwụwaanyanwụ,
Igbo ndị Mgbada Ndịdaanyanwụ na Igbo ndị Mgbada Ọwụwaanyanwụ.[13]
Na Naigịria taa, ala Igbo mejuputara steeti ndịa; Abia, Anambara, Ebonyi, Enugwu,
Imo, na isi akụkụ nke Delta na Rivers. Obere akụkụ nke Akwa Ibom, Krọs Riva, Edo, na akụkụ
Kogi Steeti.[14]
Igogoro Enugwu Ezike dị na Ngbagougwu ala Igbo gunyere Nsụka, Ụdị na Abakịlịkị.
Igogoro Enugwu Ezike dị n’ime ndọrọdọrọ ọchịchị Igbo Eze Nọt nke dị n’ime
Enugwu Steeti.
Igbo Izugbe
Igbo
izugbe bu asụsụ nke onye obụla bu nwa afọ Igbo na asụ ma ghọtakwa na agbanyeghi
akụkụ ala Igbo ebe onye ahụ sịrị pụta. Ọbụ maka ọtụtụ olundi enwere n’asụsụ
Igbo mere eji wee nwee Igbo izugbe iji wee jikọta ya bụ olundi ọnụ ma nwe otu
asụsụ nke aga eji na ama ndi Igbo. Ejikwa ya bu Igbo izugbe akụzịrị ndi umu akwụkwọ
nkuzi n’ ụlọ akwụkwọ. Ọbụ Igbo izugbe ka ejikwa ede edemede nke ndi enwere n’asụsụ
Igbo (ọtọgrafị) nke maazị S. E. Ọnwụ nan di kọmitịị ya weputara n’afọ 1961.
Igbo izugbe mere ka ndị ọbụla bụ ndị Igbo nwee otu asụsụ ga ejikota ha ọnụ.
Igbo
izugbe mere ka ọdịrị onye Enugwu Ezike mfe ịwọta asụsụ onye Nsụka mọbụ onye
Abakịlịkị maka na ọbụ otu asụsụ ka ọ na egosipụta. Onweghi otu mba nwe Igbo
izugbe a mana abịa na ihe banyere olu ndi, odigasịrị iche iche dika obodo ọbụna
si di.
Njirimara Igbo Izugbe
a. Ọgụgụ
ya na nghọta ya di mfe
b. Ọbụ
ya bụ olu Igbo eji ede edemede ọbụla
Uru Igbo Izugbe Bara
a. Ọ
na ewepu ịkpa oke na nkewa na etiti mmadụ na ibe ya
b. Ọ
na enye aka iwepụta otu aha ana-akpọ ọtụtụ ihe ụfọdụ enwere n’ala Igbo.
Olundi
Abịa
n’ala Igbo, enwagasịrị ọtụtụ mba di iche iche dika Enugwu Ezike, Nsụka, Abakịlịkị,
Udị, Afikpo, Mba Ise, Oweri, Oko, Uga dirigabazie. Mba ndia nwegasiri asụsụ di
iche iche ha na-asụ nke eji ama onye sina ya bụ obodo pụta. Enwere mpaghara mba ndị ọzọ bu Mbaise nke
nwekwara asụsụ Igbo eji mara ha. Asụsụ mba ndia di iche iche na-asu ka ana-akpọ
Olundi obodo. Ya bụ na, mba niile nwere olundi.
Ọ
bụ eziokwu na enwere ndịiche di na isụpụta asụsụ Igbo ndịa gasị, mana nghọta ha
bụ otu. Enwekwara ike isi na bụ olu Igbo ahụ ana asụgasị na mba di iche iche di
na ala Igbo.
Njirimara Olundi
a.
Ọ bụ olundi ka eji akụzịrị ụmụaka asụsụ
na n’ezinaụlọ tupu ha ebido akwụkwọ ebe ana akuziri ha Igbo izugbe.
b.
O na agbaso usoro ndakọrita udaume mọbụ
usoro eji edepụta mkpụrụokwu nke ọma. Imaatụ- Ku m mmiri --- Kunyem mmiri
Uru Olundi bara
a.
Ọ
bụ site na olundi ka esi enweta Igbo izugbe.
Imaatu
Nari
sitere na olundi ndi Nsụka (Enugwu Steeti)[15]
Puku
sitere na olundi ndi Umuahia (Abịa Steeti)[16]
b.
Ndi ọkachammuta Igbo dika ọkamuta
Longinus Chinagorom na ndi ọzọga gbadoro ukwu n’edere olundi wee ghazie edere
nke Igbo izugbe.
Aghọm di n’Olundi
Dịka a na-ekwu na ihe ọbụla
nwere ụrụ nwere aghọm
a.
Ọ na-eweta nkewa n’ebe ndi Igbo nọ ebe
ha anaghị asụ otu olundi
b.
Ọ na-eweta nsogbu nke awọtaghi ihe onye
mba ọzọ na-asụ.
Ụfọdụ Ndịiche dị n’Olundi Igogoro Enugwu Ezike na Igbo Izugbe
Aha Ọnụọgụgụ
Olundi
Igogoro
|
Igbo
Izugbo
|
Bekee
|
Mbụ
|
Otu
|
One
|
Ebọ
|
Abụọ
|
Two
|
Etọ
|
Atọ
|
Three
|
Enọ
|
Anọ
|
Four
|
Ishii
|
Ịsịị
|
Six
|
Ofu
|
Iri abụọ
|
Twenty
|
Ofu ebo
|
Iri anọ
|
Forty
|
Ofu eto
|
Iri ịsịị
|
Sixty
|
Aha Nri
Japaa
|
Arịbọ
|
Cassava
|
Raisi
|
Osikapa
|
Rice
|
Azịakpa
|
Ọka
|
Maize
|
Ekudu
|
Akịdị
|
Beans
|
Nkashi
|
Ede
|
Cocoyam
|
Aha Anụmanụ
Okerekwu
|
Oke
|
Rat
|
Eshi
|
Ezi
|
Pig
|
Ugọdụ
|
Nkita
|
Dog
|
Ọọkọ
|
Ọkụkọ
|
Fowl
|
Eshu
|
Ehi
|
Cow
|
Aha mpaghara ahụ mmadụ
Ishi
|
Ịsị
|
Head
|
Eka
|
Aka
|
Hand
|
Ehọ
|
Afọ
|
Stomach
|
Ifu
|
Ihu
|
Face
|
Azi
|
Azụ
|
Back
|
Olu
|
Onu
|
Neck
|
Nchi
|
Nti
|
Ear
|
Aha Mkpụrụ Asụsụ
Mbeňye
|
Ebea
|
Here
|
Mbeefe
|
Ebe ahụ
|
There
|
Nwarinwa
|
Obere
|
Small
|
Shire
|
Nnukwu
|
Big
|
Gbaliire
|
Gaa
|
Go
|
Okporo
|
Ụzọ
|
Road
|
Eshi
|
Ahụ
|
Body
|
Aha ihe ndị ọzọ dị iche iche
Iňyo
|
Ugogbe
|
Mirror
|
Ekwa
|
Akwa
|
Egg
|
Ekwọ
|
Akwụkwọ
|
Book
|
Aga
|
Akwa
|
Cloth
|
Mkpume
|
Okwute
|
Stone
|
Muňyi
|
Mmiri
|
Water
|
Eja
|
Aja
|
Sand
|
Eeshụa
|
Ahịa
|
Bush
|
Enwekara
ihe ndiche ndị ọzọ di n’ Olundi Igogoro Enugwu Ezike na Igbo izugbe mana edebe
ya na ọgaghi aba na ime akwụkwọ a.
Mmechi
Omenala ọbụla nwere asụsụ, nwekwa ụdị nri ha
na eri, ya na akwa ha na-eyi n’ahụ ha. Mana nke kacha dị mkpa na ime ha bụ asụsụ
maka na asụsụ bụ otu ihe dịkarịsịrị mkpa na ndụ mmadụ. Ihe na eme anyị bụ ndị
Igbo si anyị n’aka maka na anyi ejighi ihe anyi nwere kpọrọ ihe. Ọtụtụ mgbe na anyị na
eche na ihe ọbụla ndi ọcha wetara ka mma, nkea mere anyi ji leghara ọtụtụ ihe anyị nwere
anya wee na-eme nke ndị ọcha. Ọtụtụ ndị Igbo anaghị asụ asụsụ Igbo ka ọbụ asụsụ
maka na ha na-eche na onye ọbụla na-asu Igbo bụ onye awabeghi anya. Ihe nkea jọrọ
njọ maka na anaghị ekwu okwu omenala ma ekwughi maka asụsụ.
Ilee
anya na esere ndịa dị n’elu ihu akwụkwọ a, iga ahụ na ọdịkwa ma ndị ọcha mma idị
na eme omenala anyi. Ha na-eri nri anyi ma na-aňukwa mmanya anyi ma na-enwe obi
aňuri maka ya. Nri ha na-eri abụghị nri
ndị ọcha kama ọ bụ nri ndị Igogoro Enugwu Ezike na-akpọ Japaa nke a na-akpọ Arịbọ
n’Igbo izugbe. Mmanya ahụ ha na-aňu bụkwa mmanya ndị Igogoro Enugwu na-akpọ nkwụọcha.
Ya
bụ ndị beanyị, ka anyị ghara iche n’uche anyi na ihe ọbụla ndi ọcha nwere ka
nke anyi mma ọkachasị asụsụ. Kanyị yara igbara asụsụ anyị ọsọ maka na bụ ihe na
egosi ebe onye sị bịa.
Ọbụghị
naanị na anyị na-asụ Igbo izugbe, ọga a dịkwa mma ma-asị nan a anyị na-asụ
olundi eji mara obodo anyi. (te ewezume ne m na-asu Igbo izugbe, ne m
na-asukpotekwome aasụ ejir jaama nd beanyi Igooro). Ya bụ umenne m, ka anyị
kwalite omenaala anyi, ma kwalitekwa asụsụ anyi na ọga adịrị anyị n’mma. Ya
gazieree gi.
IZUNWAONU, NWAAMALA IGBO ONYE Umuja Ụlọ Igogoro Enugwu Ezike |
[1] Ụkọ,
Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI
AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg3
[2]
Ibid pg8
[3] Dịka
Halliday (1961:224-257)
[4] Ụkọ,
Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI
AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg10
[5] Mazị Eke nwa Onu
(26/04/2017)
[6] Ụkọ,
Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI AKANKA
N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg3
[7]
ibid
[8] Ụkọ,
Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI
AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg4
[9] Nigeria
at CIA World Factbook: "Igbo 23%" out of a population of 177 million
(2014 estimate)
[10]
From Wikipedia, the free encyclopedia. https://en.wikipedia.org/wiki/Igbo_people#cite_note-Nigeria_CIA-1.
Retrieved, 13/04/2017 05:51am
[11]
Rev. Sister J. N. Apeh, (2010) Cultural
History Of Enugu Ezike, A concise view. Auto-Century Publisher; Enugu. Pg 9
[12]
Ajụjụ ọnụ mụ jụrụ Maazị James Onu
[13] Ụkọ,
Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI
AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg3
[14] Uchem,
Rose N. (2001). Overcoming Women's
Subordination in the Igbo African Culture and in the Catholic Church:
Envisioning an Inclusive Theology with Reference to Women.
Universal-Publishers. p. 36.
[15]
Odozi Aku Mama Oluchukw
[16]
ibid