Friday 5 May 2017

Olundị Obodo Igogoro Enugwu Ezike n’ Igbo Izugbe (Igogoro Enugwu Ezike's Dialect in Standard Igbo)





Ndịnaya



Mmalite

Igbo bụ aha agbụrụ bụrụkwa aha asụsụ ha.[1] Abịa n’obodo ọbụla, otu na ihe ndi omenala eji ama obodo bụ asụsụ ha. Ya mere na a bịa n’obodo m bụ Igogoro Enugwu Ezike, ha nwere otu asụsụ (olundi) eji mara ha nke mere na onye ọbụla sụrụ ya bụ asụsụ ebe ọbụla, na-ana ama na onye ahụ bụ onye Igogoro Enugwu Ezike.
Omenala ọbụla nwere asụsụ, nwekwa ụdị nri ha na eri, ya na akwa ha na-eyi n’ahụ ha. Mana nke kacha dị mkpa na ime ha bụ asụsụ maka na asụsụ bụ otu ihe dịkarịsịrị mkpa na ndụ mmadụ[2]. Ọbụ maka nke a ka eji nwee ọtụtụ olundị n’asụsụ anyi bụ Igbo maka na ọbụ otu ụzọ na ihe kacha dị mkpa eji enwe mmekọrịta na etiti ndi mmadụ. Ọbụ ya kpatara eji asị na asụsụ mejupụtara obodo, obodo emejupụta asụsụ.[3]
N’ime ederede a, agam egosipụta ndi bu ndi Igbo, ebe ha bị n’ala Naịgerịa, Ebe obodo m si puta n’ ala Igbo, n’ asusu Igbo, olundi ndi obodo m na asụsụ  Igbo izugbe na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
Ihe kpatara m agaghị eleghara olundi anya bu na di ka Ọkammụta Longinus si kwuo “na asụsụ na-ewepụta uche (ideas); ọ bụ n’ime asụsụ ka eji amata uche.”[4] Mazị Eke nwa Onu kwụkwara si, na olu ndi obodo kacha eweputa uche n’asụsụ ọkacha oge onye na-asụ ya bu asụsụ ji olundi eji mara obodo ya wee na-asụ ya bu asụsụ.[5]
Ya bụ, na-abịa n’ obodo m bụ Igogoro Enugwu Ezike, onye ọbụla chọrọ izi ndi mmadu ozi mọbụ chọrọ igwa ndi obodo okwu ma chọọ ka egee ya ntị, ga eji olundi eji mara Igogoro Enugwu Ezike wee kwuo ya bu okwu.

Ndịigbo

Ndịigbo so n’otu n’ime agbụrụ ndị bụ ọkaibe n’ala Naịjirịa. Ọ bụ ha mejupụtara mpaghara Ọwụwaanyanwụ Naịjirịa. Ha jụpụtara n’agbata latitude 5 na 8 n’Ọwụwaanyanwụ ya.[6] Ha bichiri obosaraala dịka 50,641 kilomita (15,800 sqm).[7]Obodo ndị di na ala Igbo bụ ndịa; Anịọma taa na Steti Delta, imereime obodo dị na Steeti Rivas na Bayelsa gụrụ gawakwa ọtụtụ ndị nọcha n’ebe a na-akpọbu Steeti Benue na ndị banyekwara na Steeti Abịa, Anambara, Ebomyi, Enugwu na Imo.[8] Ndi Igbo bịsachara ebe niile di na uwa. Abịa n’Naịgirịa, ọnụọgụgụ ndi Igbo bu ihe dị ka 32,000,000.[9] Ndi bi n’ United States bu ihe dika ọnụ ọgụgụ 220,000. Ndị bị n’ Cameroon bu ihe dịka ọnụọgụgụ 100,000. Ndị bị n’ Ghana bu ihe dịka ọnụọgụgụ 60,000.[10]

Igogoro Enugwu Ezike.


Igogoro bu otu na ime ọtụtụ obodo dị n’ime nnukwu obodo ana akpọ Enugwu Ezike. Obodo ndị ahụ di n’ime Enugwu Ezike gunyere ndịa; Aguibeje, Ajị, Amachalla, Amaja, Amufie, Ette, Ezillo, Ekposhi, Igogoro, Umuogbo Agụ, Umuopu Agụ, Ikpamodo, Ikpuiga, Imufu, Inyi, Isiugwu, Iyionu, Umugbo Ekposhi, Nkpamute, Ogbodu, Ogrute, Okata, Umuogbo Ulo, Okpo, Olido, Owerre Eze, Uda, Ufodo, Ugbaike, Umuagama, Umuida, Umuopu, Uroshi na Umunaji.[11]
Obodo niile ndịa nwere otu asụsụ ma ewezụga Ette. Ihe mere Ette ji wee na-asu Asụsụ dị iche bụ maka na ha na ndi Igala bị nso, na emekoritakwa ihe ọnụ. Na agbnyeghi nkea, ọtụtụ na ime ha na-asụkwa olu ndi eji mara Enugwu Ezike. Obodo ndi a niile nwere otu omenala mana na-asukwa otu olu ndi.
Na-agbanyeghi nkea, eji idikọ na otu mara obodo Igogoro. Na eserese a di n’elu ihu akwụkwọ a bu onye ọ bụ ya wetetara ụzọ na Igogoro nke na mmadu enweghi ike ikwu maka Igogoro ma okwughi maka Maazị Obeta Nwa Ọme.[12] 

Ebe Igogoro Enugwu Ezike dị

Abia na ala igbo, enwere mpaghara di iche iche nke esi ama ebe obodo ọbụla si wee pụta. Enwere; Igbo ndi mgbagougwu, Igbo ndị Ndidaanyanwụ Ọsimiri Naija, Igbo ndi Nnọnetiti Ọwụwaanyanwụ (maọbụ Igbo Nnọnetiti), Igbo ndi krọs Riva, Igbo ndi Mgbago Ọwụwaanyanwụ, Igbo ndị Mgbada Ndịdaanyanwụ na Igbo ndị Mgbada Ọwụwaanyanwụ.[13] Na Naigịria taa, ala Igbo mejuputara steeti ndịa; Abia, Anambara, Ebonyi, Enugwu, Imo, na isi akụkụ nke Delta na Rivers.  Obere akụkụ nke Akwa Ibom, Krọs Riva, Edo, na akụkụ Kogi Steeti.[14] Igogoro Enugwu Ezike dị na Ngbagougwu ala Igbo gunyere Nsụka, Ụdị na Abakịlịkị. Igogoro Enugwu Ezike dị n’ime ndọrọdọrọ ọchịchị Igbo Eze Nọt nke dị n’ime Enugwu Steeti.

Igbo Izugbe

Igbo izugbe bu asụsụ nke onye obụla bu nwa afọ Igbo na asụ ma ghọtakwa na agbanyeghi akụkụ ala Igbo ebe onye ahụ sịrị pụta. Ọbụ maka ọtụtụ olundi enwere n’asụsụ Igbo mere eji wee nwee Igbo izugbe iji wee jikọta ya bụ olundi ọnụ ma nwe otu asụsụ nke aga eji na ama ndi Igbo. Ejikwa ya bu Igbo izugbe akụzịrị ndi umu akwụkwọ nkuzi n’ ụlọ akwụkwọ. Ọbụ Igbo izugbe ka ejikwa ede edemede nke ndi enwere n’asụsụ Igbo (ọtọgrafị) nke maazị S. E. Ọnwụ nan di kọmitịị ya weputara n’afọ 1961. Igbo izugbe mere ka ndị ọbụla bụ ndị Igbo nwee otu asụsụ ga ejikota ha ọnụ.
Igbo izugbe mere ka ọdịrị onye Enugwu Ezike mfe ịwọta asụsụ onye Nsụka mọbụ onye Abakịlịkị maka na ọbụ otu asụsụ ka ọ na egosipụta. Onweghi otu mba nwe Igbo izugbe a mana abịa na ihe banyere olu ndi, odigasịrị iche iche dika obodo ọbụna si di.

Njirimara Igbo Izugbe

a.     Ọgụgụ ya na nghọta ya di mfe
b.     Ọbụ ya bụ olu Igbo eji ede edemede ọbụla

Uru Igbo Izugbe Bara

a.     Ọ na ewepu ịkpa oke na nkewa na etiti mmadụ na ibe ya
b.     Ọ na enye aka iwepụta otu aha ana-akpọ ọtụtụ ihe ụfọdụ enwere n’ala Igbo.

Olundi

Abịa n’ala Igbo, enwagasịrị ọtụtụ mba di iche iche dika Enugwu Ezike, Nsụka, Abakịlịkị, Udị, Afikpo, Mba Ise, Oweri, Oko, Uga dirigabazie. Mba ndia nwegasiri asụsụ di iche iche ha na-asụ nke eji ama onye sina ya bụ obodo pụta.  Enwere mpaghara mba ndị ọzọ bu Mbaise nke nwekwara asụsụ Igbo eji mara ha. Asụsụ mba ndia di iche iche na-asu ka ana-akpọ Olundi obodo. Ya bụ na, mba niile nwere olundi.
Ọ bụ eziokwu na enwere ndịiche di na isụpụta asụsụ Igbo ndịa gasị, mana nghọta ha bụ otu. Enwekwara ike isi na bụ olu Igbo ahụ ana asụgasị na mba di iche iche di na ala Igbo.

Njirimara Olundi

a.     Ọ bụ olundi ka eji akụzịrị ụmụaka asụsụ na n’ezinaụlọ tupu ha ebido akwụkwọ ebe ana akuziri ha Igbo izugbe.
b.     O na agbaso usoro ndakọrita udaume mọbụ usoro eji edepụta mkpụrụokwu nke ọma. Imaatụ- Ku m mmiri --- Kunyem mmiri

Uru Olundi bara

a.      Ọ bụ site na olundi ka esi enweta Igbo izugbe.
Imaatu
Nari sitere na olundi ndi Nsụka (Enugwu Steeti)[15]
Puku sitere na olundi ndi Umuahia (Abịa Steeti)[16]
b.     Ndi ọkachammuta Igbo dika ọkamuta Longinus Chinagorom na ndi ọzọga gbadoro ukwu n’edere olundi wee ghazie edere nke Igbo izugbe.

Aghọm di n’Olundi

Dịka a na-ekwu na ihe ọbụla nwere ụrụ nwere aghọm
a.     Ọ na-eweta nkewa n’ebe ndi Igbo nọ ebe ha anaghị asụ otu olundi
b.     Ọ na-eweta nsogbu nke awọtaghi ihe onye mba ọzọ na-asụ.
 

Ụfọdụ Ndịiche dị n’Olundi Igogoro Enugwu Ezike na Igbo Izugbe

Aha Ọnụọgụgụ

Olundi Igogoro
Igbo Izugbo
Bekee
Mbụ
Otu
One
Ebọ
Abụọ
Two
Etọ
Atọ
Three
Enọ
Anọ
Four
Ishii
Ịsịị
Six
Ofu
Iri abụọ
Twenty
Ofu ebo
Iri anọ
Forty
Ofu eto
Iri ịsịị
Sixty

Aha Nri

Japaa
Arịbọ
Cassava
Raisi
Osikapa
Rice
Azịakpa
Ọka
Maize
Ekudu
Akịdị
Beans
Nkashi
Ede
Cocoyam

Aha Anụmanụ

Okerekwu
Oke
Rat
Eshi
Ezi
Pig
Ugọdụ
Nkita
Dog
Ọọkọ
Ọkụkọ
Fowl
Eshu
Ehi
Cow

Aha mpaghara ahụ mmadụ

Ishi
Ịsị
Head
Eka
Aka
Hand
Ehọ
Afọ
Stomach
Ifu
Ihu
Face
Azi
Azụ
Back
Olu
Onu
Neck
Nchi
Nti
Ear



Aha Mkpụrụ Asụsụ

Mbeňye
Ebea
Here
Mbeefe
Ebe ahụ
There
Nwarinwa
Obere
Small
Shire
Nnukwu
Big
Gbaliire
Gaa
Go
Okporo
Ụzọ
Road
Eshi
Ahụ
Body

Aha ihe ndị ọzọ dị iche iche

Iňyo
Ugogbe
Mirror
Ekwa
Akwa
Egg
Ekwọ
Akwụkwọ
Book
Aga
Akwa
Cloth
Mkpume
Okwute
Stone
Muňyi
Mmiri
Water
Eja
Aja
Sand
Eeshụa
Ahịa
Bush
Enwekara ihe ndiche ndị ọzọ di n’ Olundi Igogoro Enugwu Ezike na Igbo izugbe mana edebe ya na ọgaghi aba na ime akwụkwọ a.





Mmechi


 Omenala ọbụla nwere asụsụ, nwekwa ụdị nri ha na eri, ya na akwa ha na-eyi n’ahụ ha. Mana nke kacha dị mkpa na ime ha bụ asụsụ maka na asụsụ bụ otu ihe dịkarịsịrị mkpa na ndụ mmadụ. Ihe na eme anyị bụ ndị Igbo si anyị n’aka maka na anyi ejighi ihe anyi nwere kpọrọ ihe. Ọtụtụ mgbe na anyị na eche na ihe ọbụla ndi ọcha wetara ka mma, nkea mere anyi ji leghara ọtụtụ ihe anyị nwere anya wee na-eme nke ndị ọcha. Ọtụtụ ndị Igbo anaghị asụ asụsụ Igbo ka ọbụ asụsụ maka na ha na-eche na onye ọbụla na-asu Igbo bụ onye awabeghi anya. Ihe nkea jọrọ njọ maka na anaghị ekwu okwu omenala ma ekwughi maka asụsụ.
Ilee anya na esere ndịa dị n’elu ihu akwụkwọ a, iga ahụ na ọdịkwa ma ndị ọcha mma idị na eme omenala anyi. Ha na-eri nri anyi ma na-aňukwa mmanya anyi ma na-enwe obi aňuri maka ya.  Nri ha na-eri abụghị nri ndị ọcha kama ọ bụ nri ndị Igogoro Enugwu Ezike na-akpọ Japaa nke a na-akpọ Arịbọ n’Igbo izugbe. Mmanya ahụ ha na-aňu bụkwa mmanya ndị Igogoro Enugwu na-akpọ nkwụọcha.
Ya bụ ndị beanyị, ka anyị ghara iche n’uche anyi na ihe ọbụla ndi ọcha nwere ka nke anyi mma ọkachasị asụsụ. Kanyị yara igbara asụsụ anyị ọsọ maka na bụ ihe na egosi ebe onye sị bịa.
Ọbụghị naanị na anyị na-asụ Igbo izugbe, ọga a dịkwa mma ma-asị nan a anyị na-asụ olundi eji mara obodo anyi. (te ewezume ne m na-asu Igbo izugbe, ne m na-asukpotekwome aasụ ejir jaama nd beanyi Igooro). Ya bụ umenne m, ka anyị kwalite omenaala anyi, ma kwalitekwa asụsụ anyi na ọga adịrị anyị n’mma. Ya gazieree gi. 
IZUNWAONU, NWAAMALA IGBO ONYE Umuja Ụlọ Igogoro Enugwu Ezike







[1] Ụkọ, Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg3
[2] Ibid pg8
[3] Dịka Halliday (1961:224-257)
[4] Ụkọ, Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg10
[5] Mazị Eke nwa Onu (26/04/2017)
[6] Ụkọ, Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg3
[7] ibid
[8] Ụkọ, Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg4
[9] Nigeria at CIA World Factbook: "Igbo 23%" out of a population of 177 million (2014 estimate)
[10] From Wikipedia, the free encyclopedia. https://en.wikipedia.org/wiki/Igbo_people#cite_note-Nigeria_CIA-1. Retrieved, 13/04/2017 05:51am
[11] Rev. Sister J. N. Apeh, (2010) Cultural History Of Enugu Ezike, A concise view. Auto-Century Publisher; Enugu. Pg 9
[12] Ajụjụ ọnụ mụ jụrụ Maazị James Onu
[13] Ụkọ, Ọkm L. C. Chinagọrọm (2013) URU EZI AKANKA N’AGỤMAỤ IGBO UGBUA Owerri: I-O Publishers pg3

[14] Uchem, Rose N. (2001). Overcoming Women's Subordination in the Igbo African Culture and in the Catholic Church: Envisioning an Inclusive Theology with Reference to Women. Universal-Publishers. p. 36.
[15] Odozi Aku Mama Oluchukw
[16] ibid

3 comments:

Suggest something to Izunwaonu

FORGIVE ME. By Onuh Justus Izuchukwu

I was the man who misunderstood her intentions. She saw a Rose (flower) in my computer bag and she insisted in knowing who it is meant for...